2
 1 “Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’ 
Ntaramahụhụ na nlọta 
 2 “Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya, 
nʼihi na ọ bụghị nwunye m, 
mụ onwe m abụkwaghị di ya. 
Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya, 
ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ. 
 3 Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, 
aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. 
Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, 
ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, 
were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ. 
 4 Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, 
nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko. 
 5 Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, 
ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. 
Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, 
ndị na-enye m nri na mmiri, 
ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’ 
 6 Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu; 
aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje. 
 7 Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha. 
Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha. 
Mgbe ahụ, ọ ga-asị, 
‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m, 
nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’ 
 8 Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m, 
na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv, 
na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile 
nke o ji na-efe Baal. 
 9 “Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara, 
na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru. 
Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m, 
nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya. 
 10 Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya 
nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,* 2:10 Ndị ya na ha na-akwa iko 
ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m. 
 11 Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị; 
ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ, 
nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka. 
 12 Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi, 
nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya; 
aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa, 
anụ ọhịa ga-eripịa ha. 
 13 Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile 
bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile, 
ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya, 
pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, 
ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 
 14 “Nʼihi nke a, aga m arara ya, 
duba ya nʼime ọzara, 
jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ. 
 15 Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya, 
gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya. 
Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa, 
nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta. 
 16 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, 
“Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ 
ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.† 2:16 Maọbụ, Baal nʼasụsụ Hibru 
 17 Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya, 
ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ. 
 18 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ, 
meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ, 
na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ. 
Aga m emebi ngwa agha niile, 
agha niile ga-akwụsịkwa. 
Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ. 
 19 Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi; 
aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi, 
nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere. 
 20 Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị. 
Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị. 
 21 “Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,” 
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 
“M ga-azaghachi eluigwe, 
ha ga-azaghachi ala. 
 22 Ala ga-azaghachi ọka 
na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv, 
mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril. 
 23 Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ. 
Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’‡ 2:23 Enwekwa obi ebere nʼahụ Lo-Ruhama, 
M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,§ 2:23 Ya bụ, Lo-ammi,’ ‘Unu bụ ndị nke m,’ 
Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’ ”