8
Mmeri nʼagha nke Devid meriri 
 1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia. 
 2 Devid merikwara ndị Moab.* 8:2 Ndị Moab bụ ndị agbụrụ Lọt Jen 19:37, ha bichiri oke ala ndị Izrel nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ anwụ. Sọl lụgburu ha nʼoge gara aga. 1Sa 14:47 Devid zigara ndị ezinaụlọ ya na nke ndị ikwu ya nʼala Moab, mgbe ọ gbara ọsọ ndụ site nʼaka Sọl. 1Sa 22:3-4 Agbụrụ nna nna ochie Devid sitekwara nʼala Moab. Rut 1:22; 4:22 O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla. 
 3 Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis.  4 Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya. 
 5 Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.  6 O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. 
 7 Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem.  8 Site na Teba† 8:8 Ma ọ bụkwanụ, Beta nakwa Beirotai, bụ obodo Hadadeza na-achị. Eze Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu. 
 9 Mgbe Tou, eze Hamat, nụrụ na Devid emeriela ndị agha Hadadeza niile,  10 o zipụrụ Joram, nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee Devid, nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Joram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaọcha, nke ọlaedo na nke bronz bịa. 
 11 Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o si mee ọlaọcha na ọlaedo si na mba niile ndị ọ lụgburu.  12 Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye Onyenwe anyị ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba. 
 13 Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite. 
 14 O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. 
Ndị na-ejere Devid ozi 
 15 Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ.  16 Onyeisi ndị agha ya bụ Joab‡ 8:16 Joab bụ nwa nwanne nwanyị Devid. nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud.  17 Zadọk§ 8:17 Zadọk bụ nwa nwa Elieza, onye nchụaja, 2Ih 24:3 nke nọgidere nʼarụ ọrụ ya nʼikwesị ntụkwasị obi nye Devid. Ọ bụ ya tere Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ Devid. 1Ez 1:32-35; 1Ih 23:1; 29:22 nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze.  18 Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet.* 8:18 Ndị Keret bụ ndị si obodo Kriit, ebe ndị Pelet si nʼobodo Filistia. Ha bụ ndị agha e goro ego na-eche eze nche, gụọ akwụkwọ 1Ih 18:17 Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja. 
*8:2 8:2 Ndị Moab bụ ndị agbụrụ Lọt Jen 19:37, ha bichiri oke ala ndị Izrel nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ anwụ. Sọl lụgburu ha nʼoge gara aga. 1Sa 14:47 Devid zigara ndị ezinaụlọ ya na nke ndị ikwu ya nʼala Moab, mgbe ọ gbara ọsọ ndụ site nʼaka Sọl. 1Sa 22:3-4 Agbụrụ nna nna ochie Devid sitekwara nʼala Moab. Rut 1:22; 4:22
†8:8 8:8 Ma ọ bụkwanụ, Beta
‡8:16 8:16 Joab bụ nwa nwanne nwanyị Devid.
§8:17 8:17 Zadọk bụ nwa nwa Elieza, onye nchụaja, 2Ih 24:3 nke nọgidere nʼarụ ọrụ ya nʼikwesị ntụkwasị obi nye Devid. Ọ bụ ya tere Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ Devid. 1Ez 1:32-35; 1Ih 23:1; 29:22
*8:18 8:18 Ndị Keret bụ ndị si obodo Kriit, ebe ndị Pelet si nʼobodo Filistia. Ha bụ ndị agha e goro ego na-eche eze nche, gụọ akwụkwọ 1Ih 18:17