5
Mmehie ọjọọ 
 1 Ọ bụ akụkọ doro anya na-enwe ịkwa iko nʼetiti unu, ụdị nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. Otu onye nʼime ụlọ unu kpọọrọ nwunye nna ya, ha abụọ e biri.  2 Ma unu na-akpa nganga? Ihe unu kwesiri ime ọ bụghị ịkwa akwa na iru ụjụ, na ime ka onye mere ihe dị otu a si nʼọgbakọ unu pụọ?  3 Ọ bụ ezie na mụ na unu anọghị ugbu a, ma mụ na unu nọkwa nʼime mmụọ. Amaala m rịị onye ahụ ikpe dịka a ga-asị na mụ na unu nọ.  4 Eji m aha Onyenwe anyị ma ya ikpe. Mgbe unu zukọrọ, aga m anọnyere unu na mmụọ. Nʼoge ahụ, site nʼike Onyenwe anyị Jisọs,  5 werenụ nwoke a nyefee nʼaka ekwensu, ka ọ taa anụ ahụ ya ahụhụ, ka e nwee ike ịzọpụta mmụọ ya, mgbe Onyenwe anyị lọghachiri. 
 6 Ịnya isi unu ezighị ezi. Ọ bụ unu amaghị na nwantakịrị yiist a gwakọrọ nʼụtụ ọka na-eme ka o koo?  7 Wepụnụ ihe nʼeko achịcha a nọ nʼetiti unu, ka unu bụrụ ndị dị ọhụrụ, na ndị dị ọcha. Nʼihi na a chụọlarị Kraịst, bụ aja nwa atụrụ, nke Ngabiga anyị.  8 Nʼihi ya ka anyị mee mmemme a na-ejighị ihe na-eko achịcha nke bụ ihe ọjọọ na obi ọjọọ, kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko nke bụ obi ọcha na eziokwu. 
 9 E dere m unu nʼime akwụkwọ ozi m, ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọbụla.  10 Ọ bụghị ihe gbasara ndị nke ụwa ndị na-akwa iko, maọbụ ndị anya ukwu, na ndị na-apụnara mmadụ ihe, maọbụ ndị na-ekpere arụsị. Ọ bụrụ otu a, ọ pụtara na unu ga-esi nʼụwa pụọ.  11 Ma ugbu a, a na m edere unu ka unu na onye ọbụla nke na-akpọ onwe ya nwanna nwoke maọbụ nwanna nwanyị ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ ịkwa iko, maọbụ nwee anya ukwu, maọbụ na-ekpere arụsị, onye na-ekwutọ ibe ya, onye na-aṅụbiga mmanya oke, maọbụ onye na-apụnara mmadụ ihe. Unu na ndị dị otu a erikọla nri. 
 12 Kedụ nke gbasara m ikpe ndị na-esoghị na chọọchị ikpe? Ọ bụghị ndị nọ nʼime ka unu ga-ekpe ikpe.  13 Chineke ga-ekpe ndị nọ nʼezi ikpe. “Chụpụnụ onye ajọọ mmadụ ahụ site nʼetiti unu.”* 5:13  Dit 17:7; 19:19; 21:21; 22:21,24; 24:7