2
Ekpere Hana 
 1 Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị: 
“Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị; 
nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi* 2:1 Nʼebe a, mpi na-akọwa maka ike m elu. 
Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m, 
nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị. 
 2 “O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị; 
o nweghị onye dị karịa gị, 
o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị. 
 3 “Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, 
ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. 
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile, 
ya bụ onye na-anwale ọrụ niile. 
 4 “Ụta ndị na-ebu agha agbajiela 
ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike. 
 5 Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, 
ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. 
Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa 
ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa. 
 6 “Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, 
ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. 
 7  Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba; 
ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu. 
 8 Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye 
na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. 
Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, 
na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. 
“Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị 
nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa. 
 9 Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya 
ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. 
“Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa. 
 10 Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa. 
Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. 
Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe. 
“Ọ ga-enye eze ya ike 
bulikwaa ịdị ike† 2:10 Maọbụ, mpi nke onye ya e tere mmanụ.” 
 11 Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka. 
Ụmụ ọjọọ Elayị 
 12 Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya.  13 Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya.  14 Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo.  15 Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja,‡ 2:15 Nʼiwu e nyere banyere ịchụ aja, abụba na anụ niile abụba kpuchiri ka a na-akpọ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Lev 3:3-5,16; 4:8-10 ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, “Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ọ ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na ọ chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka ọ chọrọ.” 
 16 Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.” 
 17 Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya. 
 18 Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja.  19 Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja.  20 Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka Onyenwe anyị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri Onyenwe anyị.”  21  Onyenwe anyị gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. 
 22 Nʼoge a, Elayị abụrụla nnọọ agadi. Ọ nọkwa na-anụ ihe ọjọọ niile ụmụ ya ndị ikom na-eme ndị Izrel niile, ya na otu ha si edinakwuru ụmụ nwanyị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ebe ịchụ aja ụlọ nzute.  23 Ya mere, Elayị gwara ụmụ ya sị, “Anụla m site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị, banyere ihe ọjọọ niile dị iche iche unu na-eme. Gịnị mere unu ji na-eme ihe ọjọọ dị otu a?  24 Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị banyere unu.  25 Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide Onyenwe anyị, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ịla ha nʼiyi. 
 26 Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị Onyenwe anyị na mmadụ mma. 
Amụma megide ezinaụlọ Elayị 
 27 Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero?  28 Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ.  29 Gịnị mere unu ji na-elelị aja a na-achụrụ m, na onyinye a na-ewetara m nʼusoro dịka m si nye ya nʼiwu anya? Gịnị mere i ji na-asọpụrụ ụmụ gị karịa m, ime onwe unu ka unu gbaa abụba site nʼidebere onwe unu akụkụ kachasị mma nke onyinye niile ụmụ Izrel, ndị m, na-ewetara m. 
 30 “Nʼihi ya, otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwupụtara, sị, ‘Ekwere m nkwa na ndị ezinaụlọ gị na nke nna gị ga-eje ozi nʼihu m ruo mgbe ebighị ebi,’ ma ugbu a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, ‘Ọ gaghị adịkwa otu a nʼebe m nọ! Nʼihi na ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ, ma ndị niile na-eleda m anya, ka a ga-akpọ ihe efu.  31 Oge na-abịa mgbe m ga-ebipụ ike gị na ike ezinaụlọ nna gị, wezuga ha ka nwoke ọbụla nʼezinaụlọ gị hapụ ito ghọọ agadi.  32 Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị.  33 Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi. 
 34 “ ‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị.  35 Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile.  36 Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.” ’ ”